IHE OMUMU ATUMATU OKWU Ndi klas ndewonu o

  • Slides: 7
Download presentation
IHE OMUMU: ATUMATU OKWU Ndi klas ndewonu, o buru na m juo gi ajuju

IHE OMUMU: ATUMATU OKWU Ndi klas ndewonu, o buru na m juo gi ajuju I zaa n’isi Nwabudu biko zaa n’isi Lekwoo nnukwu diokpa no n’elu aja, I huru ya, I nuru ka o tu dara? Na nke taa ihe omumu anyi bu atumaatu okwu. Gini bu atumatu okwu? O bu okwu nka di iche ndi igbo ji akowa onwe ha oge ha na-asu asusu. Atumatu okwu bu okwu di omimi a na-etinye n’asusu igbo nke na-eme ka o nwee nghota na nkowa. O na-eme ka ederede kaa aka.

Na nke taa anyi ga-elebanye anya n’atumaatu okwu ndi a MYIRI: Nke a bu

Na nke taa anyi ga-elebanye anya n’atumaatu okwu ndi a MYIRI: Nke a bu ihe eji atunyere okwu n’asusu. Myiri na-egosiputa na ihe yiri ibe ya. Omumaatu: Chioma di ka nne ya Nweke di okpa ka ogugu Nwoke ahu na-eru inyi ka ezi Nwaanyi ahu di ihu ka usu MBURU: Nke a na-akowa na ihe a na-ekwu maka ya bu ihe ahu kpokwem. O dighi akowa na ihe ahu di ka, kama no o bu ihe ahu kpokwem, Omumatu: Ngozi bu usu Obi bu mbe Omaliko bu egbe na-ebu okuko

MMEMMADU: (PERSONIFICATION)Nke a bu ikwuwa ihe enweghi ndu n’onodu mmadu ka o kpaa agwa

MMEMMADU: (PERSONIFICATION)Nke a bu ikwuwa ihe enweghi ndu n’onodu mmadu ka o kpaa agwa ka mmadu Omumatu: 1. Onwu emesiela ezinaulo ahu ike 2. Uguru egbuela ndi mmadu n’afo a 3. Ekpomoku na-anaru anyi ura arahu OGHARAOKWU (IRONY) Nke a bu iji ihe joro njo wee akowaputa ihe di mma Omamaatu: 1. Nneka degburu mmadu n’ule ahu 2. Jisie ike 3. O magburu onwe ya na mma NKWUSARA (APOSTROPHE): Nke a bu ikwusara onye anoghi nso okwu ka a ga-asi na o no ya. Omumaatu: 1. Nna anyi onwu gburu gi mere anyi aru. 2. Onwu napuru gi ndu anapula anyi.

NTAKWU (SOLILOQUY): Nke a bu mmadu idi na-akpari onwe ya nkata kaa a ga-asi

NTAKWU (SOLILOQUY): Nke a bu mmadu idi na-akpari onwe ya nkata kaa a ga-asi na o nwere onye ya nay a na -akpa nkata. Omumaatu: 1. I hulanu mu mee n’elu agha mu mee n’ala agha 2. Agaghi m agbapulu ha agbapu n’obodo a. AJUJU NZARAONWE: Nke a bu ijuwa ajuju enweghi isi nke onye obula maara usa ya maobu nke achoghi usa. Omumaatu 1. Nne o bu ugboguru na-ami anyu 2. Iyi a na-eri oba 3. Utu o na-agba igwe

EGBEOKWU (HYPERBOLA): Nke a bu ihe eji ama atu ihe ma ihe eji maa

EGBEOKWU (HYPERBOLA): Nke a bu ihe eji ama atu ihe ma ihe eji maa atu adighi eru ka ya. Omumaatu: 1. Afo ya ha ka ite mmiri 2. Nna ya nwere ego na-esi isi 3. Ego Okafor mefuru ka o kwara nna ya zuru iji ruo ulo elu ise ORURUGHAOKWU (CLIMAX): Nke a na-ebido n’izizi wee buru ibu na-agbago ganye n’ogwu. Omumaatu: 1. Anyi achoghi ego ise, ihe anyi choro bu ego iri 2. Nna m zutara ogbalumtum n’afo gara aga o ruo afo a o zuta ugboala 3. O na-ewe iwe na okuko fekwasiri n’akwa o suru asu, nodu n’elu ya nyuo akpana.

NHAGIDEOKWU (ANTITHESIS) : Omumaatu: 1. Obi adighi ezu ohi mana ebe obula o gafere

NHAGIDEOKWU (ANTITHESIS) : Omumaatu: 1. Obi adighi ezu ohi mana ebe obula o gafere a malite chowa ihe achowa. 2. Azota ndu edobe onwu 3. Were oso were ije bia MGBUDA OKWU / MWETU OKWU (Anti Climax): Nke a bu usoro okwu na-amalite na nke kachanu wee ruo na nke a kacha (Smaller) Omumaatu: 1. Umunna kwuru na ndi ha choro ihu taa bu nna Chima, nne ya na umunne ya. 2. O ji anu, azu na ogiri wee si ofe ahu 3. Nweke ahu si n’ulo elu, kwapu kwaga n’ulo ala ma ugbu a, o dighi ebe o bi.

MMECHI NA NWALE Gini bu atumatu okwu? Kowaa ndiiche di nime mburu na myiri?

MMECHI NA NWALE Gini bu atumatu okwu? Kowaa ndiiche di nime mburu na myiri? Deputa uru ato atumaatu okwu bara? Were atumaatu okwu ndi a mee ahiriokwu n’otu 1. 2. 3. 4. otu a. Egbe okwu b. Mmemmadu c. Orurughaokwu d. Urokwu e. Ahannochi (metonymy) MAZI OKAFO C. C