IHE OMUMU ATUMATU OKWU Ndi klas ndewonu o
- Slides: 7
IHE OMUMU: ATUMATU OKWU Ndi klas ndewonu, o buru na m juo gi ajuju I zaa n’isi Nwabudu biko zaa n’isi Lekwoo nnukwu diokpa no n’elu aja, I huru ya, I nuru ka o tu dara? Na nke taa ihe omumu anyi bu atumaatu okwu. Gini bu atumatu okwu? O bu okwu nka di iche ndi igbo ji akowa onwe ha oge ha na-asu asusu. Atumatu okwu bu okwu di omimi a na-etinye n’asusu igbo nke na-eme ka o nwee nghota na nkowa. O na-eme ka ederede kaa aka.
Na nke taa anyi ga-elebanye anya n’atumaatu okwu ndi a MYIRI: Nke a bu ihe eji atunyere okwu n’asusu. Myiri na-egosiputa na ihe yiri ibe ya. Omumaatu: Chioma di ka nne ya Nweke di okpa ka ogugu Nwoke ahu na-eru inyi ka ezi Nwaanyi ahu di ihu ka usu MBURU: Nke a na-akowa na ihe a na-ekwu maka ya bu ihe ahu kpokwem. O dighi akowa na ihe ahu di ka, kama no o bu ihe ahu kpokwem, Omumatu: Ngozi bu usu Obi bu mbe Omaliko bu egbe na-ebu okuko
MMEMMADU: (PERSONIFICATION)Nke a bu ikwuwa ihe enweghi ndu n’onodu mmadu ka o kpaa agwa ka mmadu Omumatu: 1. Onwu emesiela ezinaulo ahu ike 2. Uguru egbuela ndi mmadu n’afo a 3. Ekpomoku na-anaru anyi ura arahu OGHARAOKWU (IRONY) Nke a bu iji ihe joro njo wee akowaputa ihe di mma Omamaatu: 1. Nneka degburu mmadu n’ule ahu 2. Jisie ike 3. O magburu onwe ya na mma NKWUSARA (APOSTROPHE): Nke a bu ikwusara onye anoghi nso okwu ka a ga-asi na o no ya. Omumaatu: 1. Nna anyi onwu gburu gi mere anyi aru. 2. Onwu napuru gi ndu anapula anyi.
NTAKWU (SOLILOQUY): Nke a bu mmadu idi na-akpari onwe ya nkata kaa a ga-asi na o nwere onye ya nay a na -akpa nkata. Omumaatu: 1. I hulanu mu mee n’elu agha mu mee n’ala agha 2. Agaghi m agbapulu ha agbapu n’obodo a. AJUJU NZARAONWE: Nke a bu ijuwa ajuju enweghi isi nke onye obula maara usa ya maobu nke achoghi usa. Omumaatu 1. Nne o bu ugboguru na-ami anyu 2. Iyi a na-eri oba 3. Utu o na-agba igwe
EGBEOKWU (HYPERBOLA): Nke a bu ihe eji ama atu ihe ma ihe eji maa atu adighi eru ka ya. Omumaatu: 1. Afo ya ha ka ite mmiri 2. Nna ya nwere ego na-esi isi 3. Ego Okafor mefuru ka o kwara nna ya zuru iji ruo ulo elu ise ORURUGHAOKWU (CLIMAX): Nke a na-ebido n’izizi wee buru ibu na-agbago ganye n’ogwu. Omumaatu: 1. Anyi achoghi ego ise, ihe anyi choro bu ego iri 2. Nna m zutara ogbalumtum n’afo gara aga o ruo afo a o zuta ugboala 3. O na-ewe iwe na okuko fekwasiri n’akwa o suru asu, nodu n’elu ya nyuo akpana.
NHAGIDEOKWU (ANTITHESIS) : Omumaatu: 1. Obi adighi ezu ohi mana ebe obula o gafere a malite chowa ihe achowa. 2. Azota ndu edobe onwu 3. Were oso were ije bia MGBUDA OKWU / MWETU OKWU (Anti Climax): Nke a bu usoro okwu na-amalite na nke kachanu wee ruo na nke a kacha (Smaller) Omumaatu: 1. Umunna kwuru na ndi ha choro ihu taa bu nna Chima, nne ya na umunne ya. 2. O ji anu, azu na ogiri wee si ofe ahu 3. Nweke ahu si n’ulo elu, kwapu kwaga n’ulo ala ma ugbu a, o dighi ebe o bi.
MMECHI NA NWALE Gini bu atumatu okwu? Kowaa ndiiche di nime mburu na myiri? Deputa uru ato atumaatu okwu bara? Were atumaatu okwu ndi a mee ahiriokwu n’otu 1. 2. 3. 4. otu a. Egbe okwu b. Mmemmadu c. Orurughaokwu d. Urokwu e. Ahannochi (metonymy) MAZI OKAFO C. C